Exodus 15

Abụ Mosis

1Mgbe ahụ, Mosis na ụmụ Izrel bụkuru Onyenwe anyị abụ dị otu a sị,

“Aga m abụku Onyenwe anyị abụ
nʼihi na o buliela onwe ya elu nke ukwuu.
Ọ tụnyela ịnyịnya
na onye na-agba ya nʼosimiri.

2Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m.
Ọ ghọrọla m nzọpụta.
Ọ bụ Chineke m, aga m etokwa ya,
Chineke nke nna m, aga m ebulikwa ya elu.
3Onye na-ebu agha ka Onyenwe anyị bụ.
Nʼezie, aha ya bụ Onyenwe anyị.
4Ụgbọ agha Fero na usuu ndị agha ya,
ka ọ tụnyere nʼosimiri ahụ.
Ndịisi agha Fero, ndị ahọrọ ahọ,
ka o mere ka Osimiri Uhie rie.
5Ogbu osimiri ahụ ekpuchiela ha.
Nʼime mmiri ahụ dị omimi ka ha rịdaruru dịka nkume.
6Aka nri gị Onyenwe anyị, dị ike,
dịkwa ebube.
Aka nri gị, Onyenwe anyị
na-etipịasị ndị iro.

7“Nʼoke ike nke ịdị elu gị,
Ị lụgbuola ndị niile na-ebili imegide gị.
I zipụrụ iwe gị dị ọkụ,
o repịara ha dịka igbugbo ọka.
8I sitere na nkuume nke oghere imi gị,
mee ka mmiri osimiri guzoro ọtọ.
Mmiri ahụ na-erugharị erugharị guzoro nʼotu ebe dịka mgbidi;
ogbu mmiri kpụkọtara rahụ nʼala ala nsọtụ nke osimiri.
9Onye iro nyara isi sị,
‘Aga m achụso ha, gafee ha.
Aga m ekesa ihe a kwatara nʼagha.
Nyejuo onwe m afọ site na ha.
Aga m amịpụta mma agha m.
Jiri aka m laa ha nʼiyi.’
10Ma i kupụrụ ikuku si gị nʼimi pụta,
osimiri riri ha,
ha mikpuru nʼime osimiri ukwu ahụ
dịka igwe.
11Onye dịka gị Onyenwe anyị,
nʼetiti chi niile?
Onye dịka gị?
Onye dị ebube nʼịdị nsọ.
Onye ịdị nsọ ya dị ukwuu

Onye otuto ya na-eyi egwu.
Onye na-arụ ọrụ dị ebube?

12“I setịpụrụ aka nri gị,
ala meghere ọnụ ya loo ndị iro gị niile.
13Site nʼebere gị,
i dupụtara ndị ị zọpụtara.
Sitekwa nʼike gị dị ebube, i duru ha
ruo nʼebe obibi gị dị nsọ.
14Ụwa niile nụrụ ya, maa jijiji.
Ndị Filistia ka oke ihe mgbu bịakwasịrị.
15Ndị eze Edọm ga-anọ nʼọnọdụ obi ịlọ mmiri.
Ndị ndu Moab niile ga-abụ ndị ọma jijiji ga-ejidekwa,
ndị Kenan niile nʼọnọdụ ịtụ egwu ga-agbaze;
16oke egwu na oke ụjọ ejidela ha.
Site nʼike nke aka gị,
ha ga-anọ jụụ dịka nkume,
tutu ruo mgbe ndị gị, Onyenwe anyị, gafechara,
tutu ruo mgbe ndị gị, ndị ị zụtara nye onwe gị, gafechara.
17Gị onwe gị ga-akpọbata ha, kụọ ha dịka mkpụrụ,
nʼelu ugwu nke ihe nketa gị.
Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị, i mere ka ọ bụrụ ebe obibi gị,
ebe nsọ ahụ, Onyenwe anyị, nke i ji aka gị tọọ ntọala ya.

18Onyenwe anyị ga-abụ eze
ruo mgbe niile ebighị ebi.”
19Mgbe ịnyịnya Fero, na ụgbọ agha ya, na ndị na-agba ịnyịnya, gbabanyere nʼosimiri, Onyenwe anyị mere ka mgbidi mmiri ahụ dagbuo ha. Ma ụmụ Izrel sitere nʼala mmiri kọrọ gafee.

Abụ Miriam na ndị inyom

20Nʼoge ahụ, Miriam onye amụma nwanyị, nwanne Erọn weere ịgba iti egwu nʼaka ya, duo ndị inyom ndị so ya, jiri ịgba egwu nke ha na-etekwa egwu. 21Miriam bụrụ abụ sị ha,

“Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ,
nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nke ukwu.
Ịnyịnya na ndị na-agba ha,
ka ọ tụnyere nʼime osimiri.”

Mmiri ilu Mara na Elim

22Mgbe ihe ndị a mesịrị, Mosis nọgidere na-edu ụmụ Izrel. Ha sitere nʼOsimiri Uhie ahụ bilie ije, jeruo ọzara Shua. Ha jere ije nʼime ọzara abalị atọ, ma ha achọtaghị mmiri ọṅụṅụ 23Mgbe ha ruru Mara, ha enweghị ike ịṅụ mmiri dị nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri ahụ na-elu ilu. (Ọ bụ ilu ilu a mere e ji kpọọ ya Mara.) 24Nʼebe a, ụmụ Izrel malitere itamu ntamu, megide Mosis sị, “Olee mmiri anyị ga-aṅụ?”

25Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa. Onyenwe anyị gosiri Mosis osisi ọ ga-atụnye nʼime mmiri ahụ. Mgbe Mosis mere otu a, mmiri ahụ malitere ịdị ụtọ ọṅụṅụ.

Ọ bụkwa na Mara ka Onyenwe anyị nọ nye ha ụkpụrụ ya na iwu ya maka iji ya nwalee ha.
26Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na unu ga-ege ntị nke ọma nʼokwu Onyenwe anyị Chineke unu, mee ihe ziri ezi nʼanya ya, ọ bụrụkwa na unu eleruo anya idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, ọ dịghị ọrịa nke m tinyere nʼahụ ndị Ijipt nke m ga-etinye nʼahụ unu. Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-agwọ unu ọrịa niile.”

27Ha bịaruru nʼobodo Elim, ebe e nwere isi iyi mmiri ala na-asọpụta dị iri na abụọ, na iri osisi nkwụ asaa. Ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri ahụ.

Copyright information for IboBIU